Ihe Ọmụmụ 43
Sọnde Nke Iri Na Iteghete Ka Triniti Gara
Oktoba 26, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Mmegbu Nwatakịrị (3)
ISIOKWU: Imebi Ụmụaka Site n’Ịkwanye Ha n’Akwamiko Maka Ịkpata Ego (CSEC)
EBE A GA-AGỤ: Liv. 19:29; Dit. 23:17-18

EBUMNOBI
i.   ime ka ọ gbaa n’anwụ na imebi ụmụaka site n’ịkwanye ha n’akwamiko maka ịkpata ego(CSEC) bụ ahịa awaa.
ii.  ịkparịta ụka ihe ndị na-ebute ụdị aka ọrụ adịgboroja a
iii. ịkparịta ụka mkpa ọ dị ichekwa ụmụaka pụọ n’ebe ndị ji ụmụaka atụ mgbere akwamiko nọ n’ọgbọ anyị a.

OKWU NKỌWA
Nwata e mebiri site na mgbere akwamiko bụ onye a ghọgburu ka o sonye, onye kweere n’onwe ya ka o sonye, maọbụ onye wepụta onwe ya maka ndụ akwamiko iji nweta ego, uwe, ụlọ, ngwa ahịa, maọbụ nledo anya. Ọ bụ ezie na ụfọdụ banyere n’ime ụdị ndụ a n’ihi ihe isi ike maọbụ n’ihi ihe ịma aka n’ihu ndị ọzọ; mana ụfọdụ dabara n’ime ụdị ndụ a n’ihi akpachapụghị anya nke ọma n’ebe ndị nne na nna ha nọ; nke ọbụla ọ bụ, ụdị omume a jọrọ njọ n’anya Chineke ma bụrụ nke ga-etinye ndụ nwata n’ihe egwu. Ajụjụ a na-ajụ ugbua wee bụrụ, olee mgbe ha malitere ụdị omume a na ndụ ha? Nke a kwesịrị ịkpali mgbakasị ahụ na ajụjụ n’obi anyị na inwe mmasị ichekwa ụmụ anyị.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị ka ị ghọtara bụ imebi ụmụaka site n’ịkwanye ha n’akwamiko maka ịkpata ego?
  2. Dị ka ọ dị na Dit 19:29, olee ihe i nwere ike ikwu bụ ihe ndị kpatara e ji emebi ụmụaka site n’iji ha atụ mgbere akwamiko n’ọgbọ anyị a?
  3. Kparịta ụka n’iwu Chineke banyere ụdị omume a dị ka ọ dị n’ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ: Liv. 19:29; Dit. 23:17-18
  4. Olee etu anyị ga-esi napụta ụmụ anyị n’ọnọdụ a jọrọ njọ? Kparịta ụka site n’ihe dị n’Ilu 19:18.

NCHỊKỌTA: Ụmụntakịrị nwaanyị anyị ji akwamiko emebi bụ ụmụ mmadụ, tinyere ụmụ ndị nke Kraịst. N’ihi ya, ka anyị tinyekwuo oge n’ịzụ ụmụ anyị n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke ma kụnye n’ime ha akparamagwa itinye aka n’ọrụ dị mma nwere ugwu na ndụ dị mma iji napụta ha n’aka ndị dị ka egbe na-eburu mmadụ ibe ha n’ụwa anyị nke oge ugbua.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE:Mee ka ụmụ gị nwaanyị bụrụ ndị na-eso ụzọ nke Chineke iji zeere itinye aka n’aka ọrụ adịghị nsọ.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Liv. 19:29 “E mela ka nwa gị nwaanyị ghara ịdị nsọ, ime ka ọ ghọọ nwaanyị na-akwa iko; ka ala gị wee ghara ịkwa iko, ka ala gị wee gharakwa ijuputa na nzube ọjọọ.”

Scroll to Top