Ihe Ọmụmụ 44
Sọnde Nke Iri Abụọ Ka Triniti Gara
Nọvemba 2, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Mmegbu Ụmụntakịrị (4)
ISIOKWU: Ịtụ Mgbere Ụmụntakịrị
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 37:2, 25-28

EBUMNOBI
i.   ịkọwa ihe ịtụ mgbere ụmụntakịrị pụtara,
ii.  ikparịta ụka ihe ndị nwere ike ibute ịtụ mgbere ụmụntakịrị na
iii. ihe mere na ndị kwere ekwe agaghị esonye n’ụdị omume a.

OKWU NKWA
Ịtụ mgbere ụmụaka bụ mgbe a na-aghọgbu ụmụaka na ndị na-eto eto, manye maọbụ mee ka ha hapụ ụlọ ha, dupu ha, ma rigbue ha, manye ha ịrụ ọrụ maka onye nwe ha irite uru ahịa, maọbụ ree ha ere. Ọtụtụ mgbe, a na-eme ya maka inweta uru aghụghọ. Josef bụ nwa nwoke Jekọb bụ ihe ịma atụ jọrọ njọ banyere  ịtụ mgbere ụmụaka. Ọ bụ ihe mwute na a ka nwere akụkọ banyere ịtụ mgbere ụmụntakịrị ọ bụladị n’ọgbọ anyị. Ụfọdụ na-eme ya nọ na chọọchị. Kedu ihe kpatara nke a na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya? Ka anyị gaa n’ihu n’ajụjụ mkparịta ụka anyị wee mata ihe ndị ọzọ.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kedụ ihe ị ghọtara bụ “ịtụ mgbere ụmụaka?”
  2. Site na Jen 37:25-28, chọpụta ma kparịta ụka ihe mere ụmụnne Josef jiri ree ya.
  3. Kparịta ụka ihe mere ndị mmadụ ji etinye aka n’ịtụ mgbere ụmụaka taa. Ihe ndị ahụ e kwesịrị ekwesị?
  4. Gịnị bụ echiche na mkpebi Chineke gbasara ịtụ mgbere ụmụaka? Ọpụpụ 21:16; Mat. 18:5-6.

NCHỊKỌTA: Nwa ọbụla a mụrụ n’ụwa a nwere ikike inwere onwe ya. Ọ dịghị onye a mụrụ ịbụ ohu onye ọzọ. Ịtụ mgbere ụmụntakịrị na-akpali iwe dị ọkụ Chineke, tinyere na ndị nke Kraịst kwesịrị ikwugide ya na ime ihe megide ya.

OKWU NTGHAR UCHE: Ezigbo aka ọrụ kacha mma!

EBE IBU N’UCHE: Ọpụpụ 21:16 “Onye na-adọrọ mmadụ ree, maọbụ ọ bụrụ na a hụrụ ya n’aka ya, a ghaghị ime ka ọ nwụa.”

Scroll to Top