Ihe Ọmụmụ 46
Sọnde Nke Abụọ Tupu Adventị
Nọvemba 16, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Mmegbu Nwatakịrị (6)
ISIOKWU: Mmegbu Maọbụ Nleghara Anya n'Ụlọ Ọrụ
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 21:14-19

EBUMNOBI
i.  ịkọwa mmegbu maọbụ nleghara anya n’ụlọ ọrụ dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ na
ii. ịkwụsị mmegbu maọbụ nleghara anya n’ụzọ ọbụla n’ụlọ ọrụ.

OKWU NKỌWA
Mmegbu maọbụ nleghara anya n’ụlọ ọrụ metụtara mmesi ike maọbụ nleghara anya a na-ahụ n’ụlọ ọrụ ọbụla a rụrụ maka ụmụntakịrị ma nke ọha ma nke ndị mmadụ nkịtị nwe dị ka ụlọ ọgwụ, ụlọ nlekọta na ndị ọzọ. N’ọgbọ anyị a, omume nke ndị nkụzi mahadum ịpịtọ ụmụ akwụkwọ maka inweta akara ule, maọbụ ọchịchọ idina ha n’ike tupu ha agafee ule, ejuputala ebe niile. Ọzọkwa, anyị na-anụ akụkọ banyere ndị dọkịnta na-edina ndị ọrịa ha na-elekọta na ihe ndị ọzọ yiri ya. Nke kachasị njọ bụ nke ụmụnwaanyị na-agbahapụ ụmụ ha mụrụ ọhụrụ n’akụkụ ụzọ maọbụ n’ọwara mmiri. E kwesịghị ịhụta ihe ndị a n’ebe onye sịrị na e kere ya n’oyiyi Chineke nọ. (Ndị Efes. 5:3).

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị ka ị ghọtara bụ mmegbu maọbụ nleghara anya n’ụlọ ọrụ site n’okwu nkọwa nke taa?
  2. Olee otú ị ga-esi kọwaa àgwà Hegga na Jen 21: 15-16, were ya tụnyere àgwà nne Moses n’Ọpụpụ 2:2-4. E nwere ndị iche ọbụla? Ọ bụrụ na e nwere, kọwaa ndị iche dị n’etiti akụkọ abụọ ahụ.
  3. Kpọpụta ihe ị hụgoro maọbụ kọọ akụkọ banyere mmegbu a na-emegbu mmadụ n’ụlọ ọrụ maọbụ nleghara ụmụaka anya, ma kparịta ụka usoro pụtara ìhè e nwere ike isi gbochie ihe ndị a. Mat. 5:16.
  4. Site n’ebe ndị a, kedu ihe Chineke kwuru banyere mmegbu ndị a? Abụ Ọma 21:17-19; Aịza 1:16; Luk 11:11-12; Jems 1:27.

NCHỊKỌTA: Onye nke Kraịst nwere akọnauche dị ndụ ekwesighi itinye aka n’ọrụ ndị omekome dị etu a, dị ka nke mmegbu n’ụlọ ọrụ maọbụ nleghara ụmụntakịrị anya. Ọ dị ezigbo mkpa na onye ọbụla e debere n’isi n’ọkwa kwesịrị ịkwanyere ọnọdụ ahụ e nyere ya ùgwù ma ghara imetọ ọkpụkpọ oku a kpọrọ ya n’ụzọ ọbụla. A gaghị agbaghapụ ụmụaka e nyere anyị maọbụ kwanụ leghara ha anya ka ha dabaa n’aka ihe ize ndụ.

AMAOKWU NTGHAR UCHE: Onye maara ọdịnihu nwatakịrị ahụ a na-emegbu emegbu?

EBE IBU N’UCHE: Gen. 21:18Bilie, welie nwa, jide ya n’aka gị, n’ihi na m ga-eme ka ọ ghọọ mba ukwu.”

Scroll to Top