Ihe Ọmụmụ 48
Ụka Adventị
Nọvemba 30, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịnabata Oziọma Dị ka Nwata (1)
ISIOKWU: Ịnabata Ịdị n'Otu
EBE A GA-AGỤ: Abụ Ọma 133

EBUMNOBI
i.   ịkọwaa ụdịdị ịdị n’otu na-adị n’etiti ụmụntakịrị,
ii.  ịkpọpụta uru dị gasị n’ịdị n’otu ndị nke Kraịst megide adịghị n’otu na
iii. igosipụta na adịghị n’otu abụghị ihe ya na okpukpe Kraịst na-agakọ.

OKWU NKWA
Ịdị n’otu n’etiti ụmụaka pụtara ịnọkọta ọnụ dị ka otu ndị n’agbanyeghị ndị iche maọbụ ọnọdụ dị iche ha nọ na ya. N’agbata afọ: asatọ ruo afọ iri na anọ, a na-enwekarị ịdị n’otu na nkwekọrịta n’etiti ndị mmadụ nọ n’otu ọgbọ a. Ịdị n’otu na-aga n’ihu site n’ịnabata na ikele onye ọ bụla maka ụtụ nke ya.  Dị ka Ndị nke Kraịst, anyị aghaghị izere nkewa n’ịgbasa ozi ọma. Ịdị n’otu dị ka Ndị nke Kraịst na-enye anyị ike n’ịgbasa ozi ọma. Mmadụ nwere ike ịda mba ma dakwa adaa ma ọ kwụrụ naanị ya, mana ịdị n’otu na-enye ike.

AJJ MAKA MKPARTA KA

  1. N’okwu nke gị, kọwaa ịdị n’otu n’etiti ụmụntakịrị ma nye ọmụma atụ gasị.
  2. Dị ka ọ dị n’Abụ Ọma 133, gịnị kwesịrị ịbụ ịdị n’otu n’etiti ndị nke Kraịst? Tụnyere 1 Kọr. 12:12-13, 22-27; Ndị Efes 4:1-3.
  3. Kpọpụta uru ndị chọọchị na-erite n’ihi ịdị n’otu dị ka ọ dị n’Ọlụ Ndị Ozi 2:42-47.
  4. Nyochaa nke ọma Ọlụ Ndị Ozi 15: 36-40; Ndị Gal. 5:13-15, ma kọwaa ihe na-akpata esemokwu na ọghọm esemokwu na-ewete n’ebe ndị nke Kraịst nọ.

NCHKTA: Ịdị n’otu n’Ụlọ Ụka apụtaghị na ndị mmadụ agaghị enwe ohere izipụta uche ha gasị banyere okwu ọ bụla; kama ọ bụ ka nzukọ ahụ na-ama ụma akwado ibe ha. Kpachara anya nabatakọrịtanụ ibe ụnụ, n’agbanyeghị ndị iche dị n’agụmakwụkwọ, agbụrụ onye si, mba onye si, ogo akụ na ụba, wdg. Ịdị n’otu a na-egosi ụwa ihe dị mma gbasara chọọchị, ma kwalite ịba ụba ihe nke ime mmụọ na kwa otuto nke ihe onwunwe.

OKWU NTGHAR UCHE: Ụlọ kewara megide onwe ya agaghị eguzo.

AMAOKWU IBU N’ UCHE: Ndị Efesọs 4: 3Na-anụnụ ọkụ n’obi idebe ịdị n’otu nke Mmụọ Nsọ n’ime ihe okike nke bụ udo.

Scroll to Top