EBUMNOBI
i. ime ka a mata omume ikwu eziokwu dị n’ime ụmụaka,
ii. igosipụta kpọmkwem na ikwu eziokwu ezughị oke maọbụ ịtụ asị bụ mmehie na kwa, na
iii. Chineke kpọrọ ndị ụgha asị.
OKWU NKỌWA
Otu nwoke bụ Onye Kraịst achọghị ịhụ onye agbataobi ya nke o ji ụgwọ. Ya mere, ọ gwara nwa ya nwoke dị afọ ise ka ọ gwa onye agbataobi ahụ na ya (nna) anọghị n’ụlọ. Mgbe onye agbataobi ahụ mechara bịa, ọ zutere nwatakịrị ahụ onye gwara ya na nna ya gwara ya ka ọ gwa ya na ya anọghị n’ụlọ. Mgbe a jụrụ ya ma ọ maara ebe nna ya gara, nwatakịrị ahụ zara na nna ya dina n’elu akwa, si etu a gbaa asị nna ya n’anwụ n’amaghị ama. Nke a bụ ihe atụ nke omume ikwu eziokwu nke ụmụntakịrị nwere. Ha amaghị etu e si atụ asị maọbụ aghọ aghụghọ. Ebe anyị gụrụ taa mere ka anyị mata na Josef esonyereghị ụmụnne ya n’ajọ omume ha, kama ọ na-abụkarị ya na-ekpughere nna ha ihe niile ha na-eme mgbe niile.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa eziokwu dị ka o si metụta ụmụaka ma nyocha ihe dị njọ n’omume nna onye otu Kraịst ahụ anyị gụtara n’okwu mmalite dị n’elu.
- Site omume ụmụnne Josef na Jen 37:31-33, kedu etú ị ga-esi kọwaa ikwu eziokwu Josef na Jenesis 37:2?
- Kọwaa agwa di na nwunye ndị nke Kraịst nke oge gboo dị n’ Ọlụ Ndị Ozi 5:1-9, na ọmụma ikpe Chineke banyere omume ha.
- Gịnị kwesịrị ịbụ omume Ndị nke Kraịst mgbe ha nọ n’ihu Chineke? Abụ Ọma. 15: 1-2; 51:6; Jọn 8:32; Kedụ ihe bụ ntaramahụhụ nye ndị ụgha niile? Mkpughe. 21:8.
NCHỊKỌTA: Ikwu eziokwu bụ ezi omume, ebe ịtụ asị bụ mmehie ma bụrụ ajọ omume. Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya banyere ihe Chineke kwuru na kwa ikpe dịịrị onye otu Kraịst ọbụla na-ekwu eziokwu nakwa ndị na-atụ asị ma na-aghọrị ndị ọzọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ị na-ejide eziokwu dị ka ụmụntakịrị.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Eziokwu bụ isi sekpụ ntị n’omume.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Jọn 8:32 Ụnụ ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka ụnụ pụa n’ohu.”
