Ihe Ọmụmụ 5
Sọnde Nke Anọ Ka Epifanị Gara
Febụwarị 2, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Idozi Ụzọ Nwatakịrị Ahụ (1)
ISIOKWU: Haa Ara Ma Kụzie N’Ụzọ Kwesịrị
EBE A GA-AGỤ: 1Samuel 1:20-27

EBUMNOBI:
i.  Ime ka a mata ihe bụ ịha nwatakịrị ara.
ii. Ịmụ mmekọrịta dị n’etiti ịha ara ime mmụọ na nke a na-ahụ anya.

OKWU NKỌWA
Idozi ụzọ pụtara imalite usoro obibi ndụ mmadụ. Ịha nwa ara na-egosi ntolite na ndụ nwatakịrị. Nwata ahụ na-esite n’ịṅụ ara banye n’iri ihe oriri ndị ọzọ na-edozi ahụ. Ugbua, nwa ahụ adaberezighi na mmiri ara ọzọ. Ịdabere sọ na mmiri ara agaghị ezuchara ya dị ka ọ na-aba ogogo otuto ọhụrụ. N’itule ya n’ime mmụọ, a na-atụ anya na onye nke Kraịst ga-eto rue ogogo ebe naanị mmiri ara agaghị ezuru ya. Ọ bụ n’oge a ka ọ ga-enwe ike bụrụ onye ga-agbaziri ndị ọzọ maọbụ bụrụ onye a ga-agbaziri n’ụzọ dị mma.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kedụ ihe ị ghọtara bụ ịha nwatakịrị ara?
  2. Gịnị ka Hana mere mgbe ọ hachara Samuel ara? 1 Samuel 1:24-27. Kedụ ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta na nke a dị ka ndị otu Kraịst?
  3. Kparịta ụka na ndị iche dị n’etiti ịha ara nke a na-ahụ anya na nke ihe ime mmụọ. 1 Samuel 2:11-18, Luk 2:39-40, 1 Ndị Kọrịnt 13:11; 14; 20, Ndị Efesọs 4:14.
  4. Kparịta ụka na mpụtara ịha ara ihe ime mmụọ n’ịgbado ụkwụ na Aịzaya 7:15, 1 Ndị Kọrịnt 2:6, Ndị Hibru 5:13-14.

NCHỊKỌTA: Ndị nne na nna ndị nke Kraịst nwere oke na ọrụ ịzụpụta ụmụntakịrị ha n’ụzọ Chineke, ma gaa n’ihu na-azụ ha rue mgbe ha banyere n’ogogo ọzọ nke ndụ ha. Otu ụdị oke na ọrụ a bụ ihe a chọrọ n’aka anyị bụ ịzụ ndị ọzọ n’ihe ime mmụọ rue mgbe ha tozuru oke n’ime Kraịst.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ịha nwa ara na-eduba n’irite nwa n’uru.

AMAOKWU IBU N’UCHE: 1 Ndị Kọrịnt 13:11Mgbe m bụrịị nwa ọhụụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụụ, ugbu a, mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị ire.

Scroll to Top