EBUMNOBI:
i. Ime ka a mata ihe bụ ịha nwatakịrị ara.
ii. Ịmụ mmekọrịta dị n’etiti ịha ara ime mmụọ na nke a na-ahụ anya.
OKWU NKỌWA
Idozi ụzọ pụtara imalite usoro obibi ndụ mmadụ. Ịha nwa ara na-egosi ntolite na ndụ nwatakịrị. Nwata ahụ na-esite n’ịṅụ ara banye n’iri ihe oriri ndị ọzọ na-edozi ahụ. Ugbua, nwa ahụ adaberezighi na mmiri ara ọzọ. Ịdabere sọ na mmiri ara agaghị ezuchara ya dị ka ọ na-aba ogogo otuto ọhụrụ. N’itule ya n’ime mmụọ, a na-atụ anya na onye nke Kraịst ga-eto rue ogogo ebe naanị mmiri ara agaghị ezuru ya. Ọ bụ n’oge a ka ọ ga-enwe ike bụrụ onye ga-agbaziri ndị ọzọ maọbụ bụrụ onye a ga-agbaziri n’ụzọ dị mma.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kedụ ihe ị ghọtara bụ ịha nwatakịrị ara?
- Gịnị ka Hana mere mgbe ọ hachara Samuel ara? 1 Samuel 1:24-27. Kedụ ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta na nke a dị ka ndị otu Kraịst?
- Kparịta ụka na ndị iche dị n’etiti ịha ara nke a na-ahụ anya na nke ihe ime mmụọ. 1 Samuel 2:11-18, Luk 2:39-40, 1 Ndị Kọrịnt 13:11; 14; 20, Ndị Efesọs 4:14.
- Kparịta ụka na mpụtara ịha ara ihe ime mmụọ n’ịgbado ụkwụ na Aịzaya 7:15, 1 Ndị Kọrịnt 2:6, Ndị Hibru 5:13-14.
NCHỊKỌTA: Ndị nne na nna ndị nke Kraịst nwere oke na ọrụ ịzụpụta ụmụntakịrị ha n’ụzọ Chineke, ma gaa n’ihu na-azụ ha rue mgbe ha banyere n’ogogo ọzọ nke ndụ ha. Otu ụdị oke na ọrụ a bụ ihe a chọrọ n’aka anyị bụ ịzụ ndị ọzọ n’ihe ime mmụọ rue mgbe ha tozuru oke n’ime Kraịst.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ịha nwa ara na-eduba n’irite nwa n’uru.
AMAOKWU IBU N’UCHE: 1 Ndị Kọrịnt 13:11‘Mgbe m bụrịị nwa ọhụụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụụ, ugbu a, mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị ire.’
