EBUMNOBI
i. ịkọwapụta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere nrubeisi na mkpa ọ dị na nzukọ Kraịst na kwa
ii. ịtụle àgwà ndị na-akwalite enweghị nrubeisi.
OKWU NKỌWA
Ị chọpụtaaala na ụmụaka na-ejikari ọsọ ejekwuru onye ọ bụla ha hụrụ n’anya na onye ha maara nke ọma. Ha na-ejidesi onye ahụ ike, mgbe ọbụla onye ahụ chọrọ ịpụnarị ha ihe, ha amalite bewe akwa. Ọ bụ ụdị nrube isi a ka anyị kwesịrị inwe n’ebe Chineke nọ dị ka ndị otu Kraịst. Okwu a bụ nrube isi na-echetara anyị maka oke anyị banyere nkwanyere ugwu na nkwado maka ịdị n’otu. Site na ya ka e nwere ihe bụ ikwesị ntụkwasị obi tinyere nnukwu nkwado na ịdị uchu n’ọrụ. Ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere nrubeisi bụ ihe na-apụta ihe na mmekọrịta anyị. Nke a pụtara na ihe niile anyị bụ nwere onye nwe ha (Jọshụa 24:15). E gosiri anyị ụdịdị nrube isi a n’ụdịdị nke a hụrụ anya n’etiti anyị na kwa n’ụdịdị sitere n’eluigwe kpọmkwem dị ka ọ dị n’iwu abụọ izizi: “Ị ga-ahụkwa Onyenweanyị bụ Chineke gị n’anya site n’obi gị dum, sitekwa na mkpụrụobi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum. Nke abụọ bụ nke a, ị ga-ahụ onye agbataobi gị n’anya dị ka onwe gị, ọ dịghị ihe ọzọ e nyere n’iwu nke dịkarịrị ndị a’’ (Mak 12: 30-31).
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Nye ọmụma atụ nwatakịrị na-erube isi ma kọwadaruo Mak 12:30-31 site n’igbado ụkwụ na nrube isi nye Chineke na mmadụ.
- Nyocha nrube isi nke Rut na Rut 1:11-17 na Mary Magdalene na Jọn 20: 1-17. Olee ụzọ ndị a si gosipụta nrube isi nye mmadụ na Kraịst.
- Depụta ụfọdụ akparamagwa ndị otu Kraịst na-egosi enweghị nrube isi nye Chineke dị ka ọ dị na Josh 24:15-16; Ndị Rom 1:21-32 na 2 Kor 6:14-16.
- Olee ụgwọ ọrụ dịịrị nrube isi nye Kraịst dị ka ọ dị na Mkpughe 2:26-28; 3:4-5, 11-13?
NCHỊKỌTA: Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị ga-egosipụta nrube isi anyị na nkwado zuru oke sitere n’obi site n’irube isi nye iwu Ya nke sị: ‘O wee kpọọ igwe mmadụ ahụ, ha na ndị na-eso ụzọ ya, ka ha bịakute Ya, Ọ sị ha, ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ka o so m n’azụ, ya jụ onwe ya, bulikwaa obe ya, na-esokwa m’ (Mak 8:34). Na mmekọrịta anyị na ibe anyị, a kpọrọ anyị ka anyị nwee nrube isi siri ike dị ka Mary Magdalene.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Inwe nrube isi bụ mkpebi na nkwubi nke sitere na mkpụrụ obi.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Mak 12: 30-31 “Ị ga-ahụkwa Onyenweanyị bụ Chineke gị n’anya site n’obi gị dum, sitekwa na mkpụrụobi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum. Nke abụọ bụ nke a, ị ga-ahụ onye agbataobi gị n’anya dị ka onwe gị, ọ dịghị ihe ọzọ e nyere n’iwu nke dịkarịrị ndị a.’’
