EBUMNOBI
i. Igosi mkpa ngozi nne na nna nye ụmụntakịrị ha.
OKWU NKỌWA
Mkpọdata bụ etu maọbụ usoro e si arịọ maka enyemaka. N’usoro ndị nke Kraịst, ọ bụ ekpere nke arịrịọ dị ọkụ (dị ka na mbido ofufe nru) na kwa ịrịọ Chineke maka odudu, ngọzi nke ihe ime mmụọ na kwazi mkpepụta. Ịkpọdata ngọzi Chineke oge niile nye ụmụntakịrị so n’ụzọ ịha nwa ara ndị otu Kraịst. Ngọzi Simiọn na Ana (onye amụma nwaanyị) nye Jizọs na-egosi anyị mkpa ịkpọdata ngọzi nye ụmụaka malite mgbe ha dị na nwatakịrị n’ihi na o so na ntọnala ime mmụọ a na-ewuru ha (Ilu 22:6). Ngọzi nke nne na nna nye ụmụ ha na-echebe ma na-edebe ha rue afọ ndị dị n’ihu.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- N’okwu nke gị, kọwaa mkpọdata na ngọzi nne na nna dị ka ọ dị na Luk 1:67 na 76.
- Gụọ Jenesis 49:22-26, Luk 2:34-35 ma kparịta ụka mkpọdata ngọzi nke Jekob nye Josef na kwa nke Simion nye Jizọs.
- Kedụ ka mkpọdata nke Jekob na Simion siri pụta ihe na ndụ Josef na Jizọs dị ka ha na-eto? Jenesis 50:15-23; Luk 2:40, 46-47, 52; Mak 1:21-22.
- Kparịta ụka etu ndị nne na nna ga-esi kpọdata ngọzi Chineke na ndụ ụmụ ha. Deut. 6:6-7; Ndị Efesọs 6:4.
NCHỊKỌTA: Ndị nne na nna nwere ike ịgbahapụ ụmụ ha nye onye iro ahụ ma ha akpachaghị anya na-akpọdata ngọzi Chineke nye ha. Ka anyị dị ka ndị nne na nna ndị otu Kraịst weghara ọrụ a dị mkpa ka e wee zụlite ọgbọ ga-eburu ma debezue ngọzi Chineke.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Abụ m ngọzi ka ọ bụ abụmọmụ nye ụmụ m?
AMAOKWU IBU N’UCHE: Luk 1:76 ‘Ọzọkwa, gị onwe gị, nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke onye kachasị ihe niile elu. N’ihi na Ị ga-aga n’iru Onyenweanyị idozi ụzọ ya niile.’
