Ihe Ọmụmụ 7
Sọnde Septụagesima
Febụwarị 16, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Idozi Ụzọ Nwatakịrị Ahụ (3)
ISIOKWU: Ime Mmiri Chukwu Ụmụntakịrị
EBE A GA-AGỤ: Ọlụ Ndị Ozi 16:15, 33; Ndị Kọlọsị 2:11-12

EBUMNOBI:
i.   Ịkọwa ihe ime mmirichukwu ụmụntakịrị bụ.
ii.  Ịkọwa mmetụta mmirichukwu na obibi ugwu na kwa,
iii. Ịkọwa ime mmirichukwu ụmụaka site n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.

OKWU NKỌWA
Ime mmirichukwu ụmụntakịrị nke a na-akpọkwa ịgụ nwata aha na mmirichukwu n’usoro ndị otu Kraịst bụ emume ime nwa mmirichukwu. E kwenyere na ime nwata mmirichukwu n’agba ọhụrụ gosipụtara ibi nwa ugwu n’agbaochie dị ka ọ dị na Ndị Kọlọsị 2:11-12. Ụmụntakịrị so n’ọgbụgba ndụ Chineke dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ (Jenesis 17:7, Dit. 29:10-12; Ọlụ Ndị Ozi 2:38-39). N’otu aka ahụ, ime mmirichukwu bụ mmezu nke ọgbụgba ndụ ọhụụ n’ime Kraịst dị ka ọ na-eweta nsacha pụọ na njọ na nnabata nke ụmụ ọgbakọ ndị nke Kraịst nke ibi ugwu na-egosi.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTAỤKA

  1. Kedụ ihe bụ nghọta gị banyere ime mmirichukwu ụmụntakịrị?
  2. Site n’ebe ndị a, kọwaa ime mmirichukwu ụmụaka n’usoro Akwụkwọ Nsọ (Jenesis 17:7, Ọlụ Ndị Ozi 16:14-15, 32-33) na kwa ụzọ o si yite obibi ugwu (Ndị Kọlọsị 2:11-12).
  3. Dị ka onye nke Kraịst, kedụ etu ị ga-esi kwado ime mmirichukwu ụmụaka? Matiu 19:13-14; Ọlụ Ndị Ozi 2:38-39, Nkpughe 20:12).
  4. Ime mmirichukwu, ọ pụtara ịga eluigwe? Tụlee n’ụzọ ịzụlite nwatakịrị n’ezi omume dị ka ụzọ ịkwadobe ụmụntakịrị anyị maka Alaeze Chineke. Ọlụ Ndị Ozi 21:8-9, 2 Timoti 1:5-6.

NCHỊKỌTA: Ime mmirichukwu ụmụaka so n’otu ihe dị oke ọnụ anyị natara dị ka Chọọchị. N’agbanyeghị na ọ bụghị asambo ịba Alaeze Chineke, maọbụ ịnabata nwata n’me igwe atụrụ nke Kraịst site na nkwupụta nke ndị mụrụ ya na mmirichukwu kwuru n’ihi ha. N’ihi nke a, ka anyị na-agba ndị nne na nna ndị otu Kraịst ume ka ha ghara ịgọnarị ụmụ ha ohere a dị mkpa ịkpọbata n’ime nzukọ Kraịst.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Mkpọchapụ na-abịa ọsọ ọsọ na-echere okpukperechi ọbụla enweghị ụmụntakịrị.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ọlụ Ndị Ozi 16:33 ‘Ọ wee kuru ha n’otu oge awa nke abalị ahụ, saa nya ihe otiti ha; ngwa ngwa e wee mee ya mmirichukwu, ya onwe ya na ndị ya niile.

Scroll to Top