Ihe Ọmụmụ 8
Sọnde Sexagesima
Febụwarị 23, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ụdịdị na Akparamagwa Nwatakịrị (1)
ISIOKWU: Ịdị Ike
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 37:5-10

EBUMNOBI:
i.  ikparịta ụka ụdịdị ịdị ike dị n’ime ụmụntakịrị na kwa,
ii. ime ka ọ pụta ihe bụ etu ụdịdị ịdị ike ụmụntakịrị sị dị mkpa n’ọsọ eluigwe anyị.

OKWU NKỌWA
Ịdị ike dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu Merriam-Webster nke ọwa ikuku si kọwa pụtara ịdị ngwa n’ihe ọbụla a hụrụ anya. Ịdị ike nke nwatakịrị bụ ike ahụ dị n’ime ha na-enye ha ọchịchọ ime ihe mgbe ọbụla. Ụmụntakịrị nwere ume n’ụdịdị ha n’ihi na ha na-eto eto ma na-abawanye. Na ndụ a, ụmụaka dị ike na-enwekarị mkpali ime ihe, na-etinye uche n’ihe ha na-eme ma na-aga n’ihu n’ihe ọbụla ha na-eme. N’ebe anyị gụrụ taa, Jizọs bụ Onye nlere anya anyị gosiri mmasị Ya ịrụ ọrụ nna ya site n’ịlaghachi Jerusalem (Luk 2:42). Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-emeghekwu anya anyị na nke a na etu anyị ga-esi si na nke a mụta ihe n’ọsọ eluigwe anyị.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kedụ etu ị ga-esi kọwaa ịdị ike nwatakịrị site na Luk 2:43? Tụlerịkọta ya na Ọpụpụ 2:4, 7-8, na kwa 1Samuel 3:1.
  2. N’ebe ndi a, a gụrụ n’elu (Luk 2:43, Ọpụpụ 2:4, 7-8, 1 Samuel 3:1), kedụ etu ị ga-esi kwubie na ịdị ike nwata na-eduba n’agamnihu ọtụtụ oge?
  3. Gịnị bụ ịdị ike onye otu Kraịst? Na uru ya site n’ Ọpụpụ 23:25-26; Joshua 1:8, 1 Samuel 7:3; Ọlụ Ndị Ozi 4:33-34.
  4. Kedụ ka anyị, dị ka ụmụntakịrị ga-esi dị ike n’ihe Chineke n’oge dị etu a mgbe ọnụnụọkụ n’obi ịrụ ọrụ dị ka ndị nke Kraịst na-ada ada? Abụ Ọma 69:9; Matiu 6:33, Jemis 2:17.

NCHỊKỌTA: Dị ka ndị otu Kraịst, ka anyị mụta ụdịdị agwa ịdị ike nke nwatakịrị ma dị  ike n’ọsọ eluigwe anyị. Ịbụ onye kwere ekwe ezuchaghị; anyị ga-adị ike n’ikwu okwu Chineke na isonyesi ike n’ihe nke Chineke.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ịdị ike n’ihe Chineke bụ ka Chineke dị ike n’ihe anyị.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Jemis 2:17 ‘Ọbụna otu a, okwukwe ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.

Scroll to Top