Ihe Ọmụmụ 9
Sọnde Quịnquagesịma
Maachị 2, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Akparamagwa na Njirimara Nwatakịrị
ISIOKWU: Ọchịchọ
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 37:5-10

EBUMNOBI:
i.  ịkwa ọchịchọ inweta ihe dị n’ime ụmntakrị.
ii. ịkparta ka n’ihe Akwkw Ns kwuru maka ọchịchọ inweta ihe na aka ọ na-enye n’ igba s eluigwe any.

OKWU NKỌWA
Ọchịchọ bụ nnukwu agụụ inweta ihe maọbụ mee nke ọma n’ihe mmadụ chọrọ inweta kpọmkwem. Ọ bụ ya na-akpali agbamume na ime nke ọma na ndụ. Ọchịchọ inweta ihe nke dị n’ime nwata ọbụla bụ ihe na-enye ya ike inweta ihe ọbụla ọ chọrọ. Dị ka ọ dị n’ebe anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ taa, a hụrụ ezigbo agwa a n’ime Josef site na nrọ ya gasị (Jenesis 35: 5-10). Devid (na Samuel 17: 32-50) nwere nnukwu ọchịchọ ibuso Goliath agha. Igba ọsọ eluigwe ndị nke Chineke nke mmadụ enweghị mkpebi ịgbaru ya n’isi ma soro Kraist chịkọọ eze ga-abụ ịkwọchaa aka tieere ọkụkọ akị. A kwadoro isiokwu ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ anyị a ka anyị kparịtakwuo ụka na nke a.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kparịta ụka banyere ọchịchọ ụmụntakịrị dị ka ọ dị n’ebe anyị gụrụ (Jenesis 37: 5-10)
  2. Lemie anya ime nyochaa akwụkwọ 1 Samuel 17: 37-50 ma kọwaa ụdịdị ọchịchọ Devid nwere na ihe o wetaara ya.
  3. Dị ka ọ dị na Ndị Filipai 2:3, ọchịchọ abụ mmehie ka ọ bụ ezigbo omume onye nke Kraist kwesịrị inwe? Ọzọ kwa, kedu otu oke ọchịchọ ga-esi bụrụ agwa ọma nke ga-enye aka n’ịtọghata mkpụrụobi dị ka ọ dị na Matiu 28:19-21; 1 Ndi Kọr. 9:16.
  4. Gịnị bụ oke ọchịchọ, olee kwanụ ka ọ ga-esi weta ila n’iyi nye ndị nke Kraịst? 2 Samuel 6:3, 6-7; Jọn 18:10-11.

NCHỊKỌTA: Dị ka ụmụ Chineke, ọ bụghị ihe ọjọọ ma onye ọbụla n’ime anyị nwee ihe nlegara anya na ọchịchọ na-akpali ya. Ọchịchọ anyi ga-agbakwasịrịrị ụkwụ n’ebe Chineke nọ na imezu uche ya. Anyị ga-atụkwasị obi anyị na uche anyi na Kraist, dị njikere ịga n’ihu dị ka ọ na-edu anyị; ma mara na ihe na-egosi ime nke ọma adabereghị n’ego ole anyị nwere, kama ọ dabeere n’ohere anyị nwere igosi ịhụnanya, na ijere ndị ọzọ ozi ma site n’ụzọ dị etu a nye Chineke otuto.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ọchịchọ sitere na Chineke dabeere na Kraịst.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndi Filipi 2:3 “Ụn emela ihe bla n’z kpa iche iche mab n’z ch otuto efu, kama n’obi d ume ala na-agrta ibe ụnụ na nd ka n onwe n mma.

Scroll to Top