Mgbakwụnye 3
--
--
ISIOKWU IZUGBE: Ịbụ Ezigbo Onye Ụka
NDỊNISIOKWU: Iji Mgbasapụ Aka Nye Onyinye
ISIOKWU: Iji Mgbasapụ Aka Nye Onyinye
EBE A GA-AGỤ: 2 Ndi Korint 9:6-11

OKWU NKOWA
Iji mgbasapụ aka nye onyinye bụ omume iji mmasi na obi aṅụri nye onyinye maka ije ozi Chineke na kwa ọdimma nke mmadụ. Ọ bụkwu ụzọ isi fee Chineke ofufe. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-enye onyinye iji gosi onwe na ịchọ otuto efu nke  sitere n’ebe mmadụ nọ.

Nọnọdụ dị otu a ka eji adụ anyi ọdụ ka anyi were obi anyi niile wee na-enye n’enweghị ntamu dị ka ọ di n’ebe anyị gụrụ. Ebumnobi ihe ọmụmụ a bụ ịgba anyi ume iji mgbasapụ aka na-enye onyinye mgbe niile.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA KA

1a.  Kedụ ihe ọ pụtara bụ inye na mgbasapụ aka?
1b. Kedụ ihe kpatara onyinye jiri bụrụ otu n’ ime nkwenye nke ndi nke Kraịst? Jọn 3:16.

2a. Olee ihe a na-atụ anya na anyị ga-enye?
2b. Kparịtaụka onyinye dị ka ụzọ isi fee Chineke – 1 Ndị Eze 3:4-5.

3.   Gụọ ebe ndi a ma kparịta ụka ihe na otu ndi mmadụ ndị a siri nye-
a.    Abraham- Gen. 22:9-12
b.    Ndị Israel-Ọpụpụ 36:4-7
ch.  Solomon- 1 Ndi Eze 3:4-5
d.    Nwanyị di ya nwụrụ nke Zarephath-1 Ndi Eze 17:7-11,15
e.    Nwanyi di ya nwụrụ nke bụ ogbenye – Mak 12: 42- 44.

4.    Kedụ ihe o ji esirị ụfọdụ ndị mmadụ ike inye na mgbasapụ aka?

5.    Kpọkpụta uru di iche iche dị n’inye onyinye na mgbasapụ aka. Luk 6:38, 2Kọr. 9:6 -7, Ilu 11:24 – 25

NCHỊKỌTA:  Ịnye onyinye mgbe ọbụla agaghị eme mmadụ ka ọ daa ogbenye kama ọ na-emeghe ụzọ di iche iche nye ọtụtụ ngọzi. Ka anyi site n’onyinye anyị fee Chineke n’ihi na Chineke na-ahụ onye ji obi ụtọ na-enye n’anya.

AMAOKWU ỊBU N’UCHE: Luk 6:38

Scroll to Top