Mgbakwụnye 4
--
--
ISIOKWU IZUGBE: Ịbụ Ezigbo Onye Ụka
NDỊNISIOKWU: Inye Ekele
ISIOKWU: Inye Ekele
EBE A GA-AGỤ: Luk 17:11-19

OKWU NKỌWA
Ịnye ekele bụ ngosipụta nke obi nnabata site n’okwu ọnụ na kwa n’ụzọ ndi ọzọ a na-ahụ anya, maka ihu ọma, amara, enyemaka, wee dịrị gaba, mmadụ natara. Ọ bụ ụgwọ anyị ji Chineke, bụ nke a apụghị ịkwucha wee rue ọnwụ.  Akụkọ dị n’ebe anyị gụrụ na-egosipụta na Chineke na-atụ anya n’aka anyị mgbe niile ịkele Ya ekele n’ihe nile ọ na-emere anyị. Ị na-echeta nkwa Ya n’adịghị agharịpụ kwesịrị ị na-akpali anyị ị na-enye Ya ekele kwa ụbọchị.  Ya mere, ebumnobi ihe ọmụmụ a bụ ka e mepee anya anyị ma kpalie obi anyi ime ihe dị mma kwesịrị ka anyị na-eme.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

1.    Na nghọta nke gị gịnị ka ọ pụtara bụ ịnye ekele?

2.    Kpọputa akụkụ ịnye ekele dị ịche ịche e gosipụtara n’ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ
a.    1 Ihe Emere 29:9 (Obi jupụtara n’ ọnụ ma dịkwa njikere)
b.    1 Ihe Emere 29:10-14, 2 Ihe Emere 20:21, Mkpughe 4: 11 (Ngosipụta obi ekele site n’okwu ọnụ na abụ).
ch.  Gen 8:20; 1 Ndị Eze 3:4; 2 Kor. 8:1-3 (Ikere ekele nke ihe a na-ahụ anya)

3a.  Gịnị kpatara anyị ga-eji na-enye Chineke ekele mgbe niile? Abụ Ọma 103:1-5
3b.  Gịnị kpatara o ji esiri ụfọdụ mmadụ ike ịnye Chineke ekele maka ịdị mma Ya na abere Ya na ndụ ha?

4.    Kedu uru dị n’ịnye ekele? Jen.8:21- 22; 1 Ndị Eze 3:4- 5; Ọlụ Ndị Ozi 16:24 – 26; Abụ Ọma 67:5- 7.

NCHỊKỌTA: Chineke na-atụ anya k’anyị na-enye Ya ekele maka obi ọma Ya na ebere Ya n’ ebe anyị nọ. Ọ dịghị ihe funarịrị anyị n’inye ekele kama ọ bụ uru ka anyi ga-enweta. Ka anyi tinye agwa ọma a nke nwere ọtụtụ uru n’ọrụ ugbua.

AMAOKWU IBU N’UCHE: 1 Ndị Tes. 5:18

Scroll to Top