OKWU NKỌWA

Ọ dabara nke ọma na Jizọs ji igọzi ụmụntakịrị wee sochie nkụzi Ya maka alụmdi na Nwunye anya, n’ihi na ụmụntakịrị bụ ihe nketa nke ndị lụrụ di na nwunye. Jizọs ahụghị ụmụntakịrị dịka abụmọnụ maọbụ ibu arọ. “Abụọ ga-aghọ otu anụ ahụ” na-emezu n’ịmụ ụmụ. Ịhụnanya nke nne ma nna na-agbagidesi mkpọrọgwụ ike mgbe ọ na-apụta ihe n’ahụ ndị ọzọ n’ezinaụlọ.

Ọtụtụ ndị nne na nna na-akpọtara Jizọs ụmụaka ka O bikwasị ha aka ma gọzie ha. Ma ndị na-eso Jizọs chere na nke a bụ igbu Jizọs oge. Ha malitere ịbara ndị na-akpọta ụmụntakịrị ha mba. Ọ doro anya na ndị na-eso ụzọ ya echefuola ihe Jizọs kwuru na mbụ maka ụmụntakịrị na ihe egwu dị n’ ime ka ha ma n’ọnya. (Matt.18:1-14). Jizọs baara ndị ozi Ya mba, gwa ha ka ha ghara igbochi ụmụntakịrị ịbịakute Ya. Ọ bụghị naanị ndị okenye, ndị a na-ahụta uru ha bara karịa ụmụaka, ga-aba Alaeze. Ọ dịịrị onye ọ bụla ji okwukwe bịakwute Onyenweanyị. Nke a gosiri na Jizọs nwere oge maka ụmụntakịrị niile (Matt.19:15) maka na Ọ gọziri ha nile tupu O si na mpaghara ahụ pụa.

N’ịga n’ihu, ihe Jizọs kwusiri ike etu o si metụta ụmụntakịrị na Alaeze Chineke dị nnukwu mkpa nke na onye eṅomighi nwedanala na ịdị ọcha n’obi ha, agaghị aba Alaeze Chineke. (Matt.18:1-4). Ọ bụ nke a mere ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ anyị nke afọ a ji ele anya n’isiokwu a bụ, ỌCHỊCHỊ ISI NKE CHINEKE: ỤMỤNTAKỊRỊ NA ALAEZE CHINEKE (Matt.19:14).

A haziri akwụkwọ ọmụmụ a n’isiokwu izugbe nwere ndịnisiokwu iri na isiokwu iri ise na otu. Malite n’isiokwu okwu a bụ nwatakịrị; inabata nwatakịrị; agwa nwatakịrị; ngosipụta ihe ọjọọ megide naanị ụmụ nwanyị maọbụ naanị ụmụ nwoke n’Akwụkwọ Nsọ; Agwa ọjọọ ụmụntakịrị, ịkụnye ezi omume n’ime ụmụntakịrị, ezi ọzụzụ nwatakịrị, nwatakịrị nọ n’afọ, mmegbu nwatakịrị we rue n’ ịnara ozi ọma dịka nwatakịrị. A kwadoro nke ọma maka ụka ndị pụrụ iche dịka Ụka ndị Nne, Ụka ndị Nna, Ụka Igu Nkwụ, Ụka Isita na ọnwa Mba gasị, iji hụ na ọmụmụ ụbọchị ndị a dabara dị ka omenala chọọchị sị dị.

Anyị si n’ala ala obi anyị na-ekele ndị niile nyere aka n’ọrụ a nke Ven Charles O Fakiyesi nọ n’isi ya, maka oge na kwa ike ha tinyere n’ibipụta akwụkwọ ọmụmụ a. Anyị na-ekele kwa ndị ndu nke otu a na ndị na-achịkọba ha na Prọvinsị, tinyere ndị nna anyị n’ime Chineke niile tụtara aro. Ka Onyenweanyị gọzie ha ma kwụghachi ha ụgwọ ọrụ ọma ha rụrụ.

Ndị nna anyị n’ime Chineke anyị na-ajụ ase na ndị isi otu dị iche iche.

The Rt. Revd Dr Foluso Olugbenga Babatunji
Rt Revd. Prof Ajulo (Rtd)
Ven. Charles O Fakiyesi
Ven. Precious Nyanabobi
Ven. Dr E. Tayo Faremi
Revd. Can Ozioma
Revd. Dr Jola Osinjonwo
Sir Wilberforce Derikoma
Revd. Canon Timothy Oni.

The Rt. Revd Foluso Olugbenga Babatunji, Ph.D.
Chairman, Liturgy & Spirituality Committee, Church of Nigeria

Scroll to Top